Proverbs 12

1Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya,
ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.

2Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị,
ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.

3Onye ajọ omume agaghị anọgide,
ma apụghị ihopu onye ezi omume.

4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,
ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.

5Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi,
ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.

6Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ,
ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.

7Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi,
ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.

8Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ,
ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.

9Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu,
karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.

10Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,
ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.

11Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.

12Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere,
ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.

13A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya,
ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.

14Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ,
inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.

15Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi,
ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.

16Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ,
ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.

17Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu,
ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.

18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha,
ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.

19Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi,
ma okwu ụgha anaghị adịgide.

20Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ;
ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.

21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume,
ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.

22 Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị,
ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.

23Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha,
ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ. a

24Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị,
ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.

25Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba,
ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.

26Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya,
ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.

27Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ,
ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.

28Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ,
nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.
Copyright information for IboBIU